1. Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi.
2. Solomon we gosi ya okwu-ya nile: ọ dighi kwa okwu ọ bula ezonariri Solomon nke ọ nēgosighi ya.
3. Eze-nwayi Sheba we hu amam-ihe Solomon, na ulo nke o wuru,