2. Ihe Emere 7:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n'elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu.

2. Ndi-nchu-àjà apughi kwa ibà n'ulo Jehova, n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova.

3. Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Ihe Emere 7