2. Ihe Emere 6:32-37 Bible Nso (IGBOB)

32. Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; mb͕e ha gābia kpe ekpere n'ebe ulo a di:

33. Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke M'wuworo.

34. Mb͕e ndi-Gi gāpu ibuso ndi-iro-ha agha, n'uzọ ọ bula I gēziga ha, ha we kpere Gi n'uzọ obodo ahu nke I rọputaworo, na n'ebe ulo a di nke m'wuworo aha-Gi:

35. Gi si kwa n'elu-igwe nuru ekpere-ha na aririọ-amara-ha, mezie ikpé-ha.

36. Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala di anya ma-ọbu nke di nso;

37. ha we chègharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndọta-n'agha-ha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi;

2. Ihe Emere 6