7. Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.
8. N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha n'elu ebe ib͕e ahu, cherubim ahu we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu.
9. Nkpa-n'aka di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ib͕e ahu n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: o we di n'ebe ahu, rue ta.
10. Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.