2. Ihe Emere 5:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke.

2. Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

3. Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze n'ememe, nke ahu bu ọnwa nke-asa.

4. Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu.

5. Ha we bugota ib͕e ahu, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bugotara ha.

2. Ihe Emere 5