1. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, me ya eze n'ọnọdu nna-ya nime Jerusalem.
2. Joahaz b͕ara orú arọ na atọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọnwa atọ nime Jerusalem.
3. Eze Ijipt we wezuga ya nime Jerusalem, rie ala ahu nra ọgu talent ọla-ọcha ise na otù talent ọla-edo.
4. Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt.
5. Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya.
6. Nebukadneza, bú eze Babilon, we rigota imegide ya, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, ime ka o jerue Babilon.
7. Nebukadneza we chiri ufọdu n'ihe ulo Jehova chibata na Babilon, o tiye ha n'ulo uku ya nime Babilon.
8. Ma ihe nile Jehoiakim mere nke fọduru, na ihe-árú-ya nile nke o mere, na ihe achọputaworo imegide ya, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.
9. Jehoiakin b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze ọnwa atọ na ubọchi iri nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.
10. Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.
11. Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem:
12. o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n'iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n'ọnu Jehova.