9. Konanaia kwa, na Shemaia na Netanel, bú umu-nne-ya, na Hashabaia na Jeiel na Jozabad, bú ndi-isi nke ndi Livai, buliri nye ndi Livai nnù ewu na aturu iri-na-abua na ọgu iri, na nnù ehi na ọgu ise, iji chu àjà-ngabiga.
10. Ewe dozie òfùfè ahu, ndi-nchu-àjà we guzo n'ebe-nguzo-ha, na ndi Livai n'òkè nile ha, dika ihe eze nyere n'iwu si di.
11. Ha we b͕ue anu ngabiga ahu, ndi-nchu-àjà we wusa ọbara nke ha natara n'aka-ha, ndi Livai we nāb͕a akpukpọ-ha.
12. Ha we wezuga àjà-nsure-ọku, inye ha dika nkewa nile nke ulo nke ndi bu nna umu ndi Israel si di, iweta ha nso Jehova, dika edeworo ya n'akwukwọ Moses. Otú a ka eme-kwa-ra ehi.
13. Ha we were ọku sie anu ngabiga dika ikpé-ya si di: ma ha siri ihe nsọ ọzọ nile n'ite, na n'ite isi miri, na n'ite-ofé, būru ha b͕akuru umu ndi Israel nile.