7. Ọ kwatue ebe-ichu-àjà nile, tipia Asherim na arusi nile apiri api, ha we ghọ uzuzu, o b͕utu-kwa-ra arusi-anyanwu nile n'ala Israel nile, we lata na Jerusalem.
8. Ma n'arọ nke-iri-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ọ mesiri ka ala-ya na ulo ahu di ọcha, o zigara Shefan nwa Azalia, na Maaseia, bú onye-isi obodo ahu, na Joa nwa Joahaz, bú onye-ncheta, ime ulo Jehova, bú Chineke, ka ọ di ike.
9. Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem.