23. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,
24. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ ahu nke ha guworo n'iru eze Juda:
25. n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe wusa ọnumam n'ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.
26. Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,
27. n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
28. Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.
29. Eze we ziga, chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem.