7. Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n'ihi eze Asiria, ma-ọbu n'ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n'ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya:
8. nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.
9. Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n'agha, ya na ndi nile ọ nāchi,) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si,
10. Otú a ka Senakerib, bú eze Asiria, siri, N'ìhe gini ka unu onwe-unu nātukwasi obi, unu we nānọdu n'ebe ewusiri ike, bú nime Jerusalem?
11. Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria?
12. Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?
13. Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli?
14. Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam?
15. Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.
16. Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia.
17. Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.
18. Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.
19. Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.