2. Ihe Emere 32:22-24 Bible Nso (IGBOB)

22. Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n'aka Senakerib, bú eze Asiria, na n'aka madu nile, we nēdu ha buruburu.

23. Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.

24. Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.

2. Ihe Emere 32