11. Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria?
12. Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?
13. Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli?
14. Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam?
15. Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.
16. Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia.
17. Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.
18. Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.
19. Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.
20. Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe.
21. Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu.
22. Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n'aka Senakerib, bú eze Asiria, na n'aka madu nile, we nēdu ha buruburu.
23. Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.
24. Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.
25. Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.
26. Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia.
27. Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;