23. Nkpọkọta ahu nile we nara idu-ọdu ime ememe ubọchi asa ọzọ: ha we were ọṅù me ememe ubọchi asa ọzọ.
24. N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba.
25. Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda.