2. Ihe Emere 25:16-28 Bible Nso (IGBOB)

16. O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.

17. Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.

18. Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.

19. I siwo, Le, i tib͕uwo Edom; obi-gi we bulie gi elu isọpuru onwe-gi: ub͕u a nọdu n'ulo-gi; n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?

20. Ma Amazaia anughi; n'ihi na Chineke ka o sitere, ka O we nye ha n'aka ndi-iro-ha, n'ihi na ha chọrọ chi Edom.

21. Joash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere.

22. Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.

23. Joash, bú eze Israel, we Jide Amazaia, bu eze Juda, nwa Joash nwa Jehoahaz, nime Bet-shemesh, me ka ọ biarue Jerusalem, we tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.

24. Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Chineke n'aka Obed-edom, na àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.

25. Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Joash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.

26. Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel?

27. Ma site na mb͕e Amazaia siri n'iso Jehova wezuga onwe-ya ha kekọtara nkekọta-madu imegide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.

28. Ha we bute ya n'elu inyinya, lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Juda.

2. Ihe Emere 25