2. Ihe Emere 20:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n'ulo Jehova, n'iru ogige ọhu;

6. ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n'elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n'ebe I nọ.

7. Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi?

8. Ha we biri nime ya, wuere Gi ebe nsọ nime ya nye aha-Gi, si,

9. Ọ buru na ihe ọjọ abiakwasi ayi, bú mma-agha ikpé, ma-ọbu ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu oké unwu, ayi gēguzo n'iru ulo a, na n'iru Gi, (n'ihi na aha-Gi di n'ulo a,) si na nkpab͕u-ayi tikue Gi, I gānu kwa, zọputa.

10. Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;

11. ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.

12. Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.

13. Juda nile nēguzo kwa n'iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.

14. Ma Mọ Jehova dikwasiri Jahaziel nwa Zekaraia, nwa Benaia, nwa Jeiel, nwa Matanaia, bú onye Livai, onye sitere n'umu Esaf, n'etiti nkpọkọta ahu;

15. ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n'iru ìgwè madu a bara uba; n'ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe.

2. Ihe Emere 20