11. ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.
12. Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.
13. Juda nile nēguzo kwa n'iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.