13. Ma ub͕u a ezitewom otù nwoke nke mara ihe, onye mara nghọta, nke Huram, bú nnam,
14. bú nwa nke nwayi nke sitere n'umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na nkume, na n'osisi, na n'ogho ododo, na n'ogho anunu, na n'ezi ákwà ọcha, na n'ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n'etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi.
15. Ma ub͕u a ọka wheat ahu na ọka barley ahu na manu ahu na manya-vine ahu, bú nke onye-nwem kwuru, ya zitere ndi-orù-ya:
16. Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n'elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem.