27. Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile.
28. Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead.
29. Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya; ha we ba n'agha.
30. Ma eze Siria nyere ndi-isi ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.
31. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, Eze Israel ka ọ bu. Ha we chigharia ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu, Jehova we yere ya aka; Chineke we kpalie ha isi n'ebe ọ nọ pua.