2. Ihe Emere 18:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehoshafat we nwe àkù na nsọpuru n'uba; o we ghọ ọgọ Ehab.

2. Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n'uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead.

3. Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m'di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n'agha ahu.

4. Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzọ ju ase okwu Jehova.

5. Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n'aka eze.

2. Ihe Emere 18