6. Obi-ya di kwa elu n'uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim.
7. Ma n'arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n'obodo Juda nile:
8. ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà.
9. Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n'aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n'etiti ndi Juda.
10. Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha.