16. onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà:
17. ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta:
18. onye so ya bu Jehozabad, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ abua na nnù iri, ndi ejikere nke usu-ndi-agha.
19. Ndia bu ndi nējere eze ozi, nāgughi ndi ahu eze tiyere n'obodo nile ewusiri ike nime Juda nile.