2. Ihe Emere 16:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya.

8. Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n'uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n'aka-gi.

9. N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.

10. Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n'ulo ọtọsi; n'ihi na o nēkosa ya ọnuma n'ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.

11. Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

12. Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia.

13. Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ọ nwua n'arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze.

14. Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.

2. Ihe Emere 16