2. Ihe Emere 15:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.

3. Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu:

4. ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya.

5. Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n'ala ahu nile.

6. Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha.

7. Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n'ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu.

8. Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n'ala Juda na Benjamin nile, si kwa n'obodo nile nke ọ naputara n'ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n'iru uzọ-nbata Jehova.

9. Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n'etiti ha site n'Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n'ihi na ha siri n'Israel dayere ya n'uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya.

10. Ha we chikọta onwe-ha nime Jerusalem n'ọnwa nke-atọ, n'arọ nke-iri-na-ise nke Esa bu eze.

11. Ha we chuara Jehova àjà n'ubọchi ahu, site n'ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri.

12. Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha;

13. na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel.

14. Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi.

15. Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.

2. Ihe Emere 15