9. Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha.
10. Esa we pua izute ya, ha we do agha n'usoro nime ndagwuruguru Zefata nime Marisha.
11. Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.
12. Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga.