2. Ihe Emere 13:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam, ka Abaija malitere ibu eze Juda.

2. Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Maikaīa nwa-nwayi Uriel nke Gibea. Agha di kwa n'etiti Abaija na Jeroboam.

3. Abaija we were usu-ndi-agha, bú ndi-dike n'agha, bū agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri, bú ndi arọputara arọputa: ma Jeroboam were orú nnù ndikom ọgu uzọ ise, bú ndi arọputara arọputa, do agha n'usoro imegide ya, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.

4. Abaija we bilie n'elu ugwu Zemaraim, nke di n'ugwu Efraim, si, Nurunum, Jeroboam na Israel nile;

5. ọ̀ bughi ọlu-unu imara na Jehova, bú Chineke Israel, nyere Devid ala-eze ibu onye-isi Israel rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná ya na umu-ya, n'ọb͕ub͕a-ndu nnú?

6. Ma Jeroboam nwa Nebat, bú orù Solomon nwa Devid, ebiliwo, we nupu isi imegide onye-nwe-ya.

7. Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha.

2. Ihe Emere 13