21. Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ).
22. Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n'etiti umu-nne-ya: n'ihi na ọ di n'obi-ya ime ya eze.
23. O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.