2. Ihe Emere 10:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.

8. Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya.

9. Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?

10. Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāsi ha, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.

11. Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

2. Ihe Emere 10