1. Timọti 4:13-16 Bible Nso (IGBOB)

13. Rue mb͕e m'gābia, nāṅa nti ọgugu-akwukwọ-gi na idu-ọdu-gi na ozizí-gi.

14. Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n'ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n'isi nke ndi bu okenye, nye gi.

15. Nējisi ike n'ihe ndia; nānọsi ike nime ha; ka iga-n'iru-gi we puta ìhè n'ebe madu nile nọ.

16. Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.

1. Timọti 4