1. Samuel 9:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n'ebe a?

12. Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a:

13. mb͕e unu bara n'obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n'ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n'ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n'ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya.

14. Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n'etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu.

15. Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,

16. Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.

1. Samuel 9