1. Samuel 8:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Samuel ghọrọ agadi, na o doro umu-ya ndikom ndi-ikpe ikpe Israel.

2. Ma aha ọkpara-ya bu Joel; aha nwa-ya nwoke nke-abua bu Abaija: ha bu ndi-ikpe nime Bia-sheba.

3. Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.

4. Ndi-okenye nile nke Israel we chikọta onwe-ha, biakute Samuel rue Rema:

5. ha we si ya, Le, gi onwe-gi aghọwo agadi, ma umu-gi ndikom adighi-eje ije n'uzọ-gi nile: ub͕u a mere ayi eze ikpe ayi ikpe dika mba nile.

1. Samuel 8