1. Samuel 5:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi Filistia were ib͕e Chineke, ha we si n'Eben-eza bubata ya n'Ashdod.

2. Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n'ulo Degon, dọba ya n'akuku Degon.

3. Ndi Ashdod we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n'ọnọdu-ya.

4. Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.

5. N'ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n'ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n'Ashdod, rue ta.

1. Samuel 5