1. Samuel 4:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Samuel we rue Israel nile nti. Israel we pua izute ndi Filistia ibu agha, we ma ulo-ikwū-ha n'akuku Eben-eza: ndi Filistia we ma ulo-ikwū-ha n'Efek.

2. Ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro izute Israel: agha ahu we nọsa, ewe tib͕ue Israel n'iru ndi Filistia: ha we tib͕ue n'etiti usoro ndi-agha Israel n'ọhia ihe ra ka nnù ndikom iri.

3. Ndi Israel we ba n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N'ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n'iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n'etiti ayi, zọputa ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi.

4. Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n'ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n'ebe ahu.

5. O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova batara n'ọmuma-ulo-ikwū, na Israel nile tiri oké nkpu, ala wee daa uda.

6. Ndi Filistia we nu olu iti-nkpu ahu, we si, Gini bu olu oké iti-nkpu a n'ọmuma-ulo-ikwū ndi-Hibru? Ha we mara na ib͕e Jehova abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū.

7. Ndi Filistia we tua egwu, n'ihi na ha siri, Chineke abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. Ha we si, Ahuhu nādiri ayi! n'ihi na ihe dika nka adighi na mb͕e gara aga.

8. Ahuhu nādiri ayi! ònye gānaputa ayi n'aka chi ndia di ike nke-ukwu? ndia bu chi nke were ihe-otiti nile ọ bula tib͕ue ndi Ijipt n'ọzara.

9. Menu onwe-unu ka unu di ike, buru-kwa-nu ndikom, unu ndi Filistia, ka unu ghara iburu ndi-Hibru ndi-orù, dika ha buruworo unu ndi-orù: burunu ndikom, bu-kwa-nu agha.

10. Ndi Filistia we bu agha, ewe tib͕ue Israel, ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya: oké ntib͕u uku we di; orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise, bú ndi ji ukwu eje, we dapu n'Israel.

11. Ewe were ib͕e Chineke; umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nwukwara.

12. Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.

13. Ọ we bia, ma, le, Ilai nānọkwasi n'oche-ya n'akuku uzọ, nēche nche: n'ihi na obi-ya nāma jijiji n'ihi ib͕e Chineke. Nwoke ahu we ba igosi ya n'obodo, obodo ahu nile we tie nkpu.

1. Samuel 4