1. Samuel 31:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Ha we bipu isi-ya, yipu ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisa ozi ahu n'ulo arusi nile ha, na n'etiti ndi-ha.

10. Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo Ashtarot: ma ha kpọgidere ozu-ya na mb͕idi Bet-shan.

11. Ndi bi na Jebesh-gilead we nu ihe bayere ya, bú ihe ndi Filistia mere Sọl,

12. ndikom nile bú dìnkpà we bilie, je ije ogologo abali ahu nile, si na mb͕idi Bet-shan buru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom; ha we biarue Jebesh, sure ha ọku n'ebe ahu.

13. Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.

1. Samuel 31