1. Samuel 3:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.

14. N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Samuel we dina ala rue ututu, we meghepu ọnu-uzọ ulo Jehova. Ma Samuel turu egwu igosi Ilai ọhù ahu.

16. Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem.

17. Ọ si, Gini bu okwu ahu nke Ọ gwara gi? biko, ezonarilam ya: Chineke me gi otú a, me kwa gi ihe ọzọ otú a, ọ buru na i zonarim okwu ọ bula sitere n'okwu nile nke Ọ gwara gi.

18. Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.

1. Samuel 3