1. Samuel 29:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n'udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n'anya ndi-isi ndi Filistia.

8. Devid we si Ekish, Ma gini ka m'meworo? gini kwa ka i hutaworo n'aru orù-gi site n'ubọchi m'nọworo n'iru gi rue ta, na m'gaghi-abà buso ndi-iro onye-nwem, bú eze, agha?

9. Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n'anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n'agha.

10. Ma ub͕u a bilie n'isi-ututu, gi na ndi-orù onye-nwe-gi ndi soro gi bia: mb͕e unu biliri n'isi-ututu, mb͕e ìhè diri unu, laghachi-kwa-nu.

11. Devid we bilie n'isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n'ututu, ilaghachi n'ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.

1. Samuel 29