2. Sọl we bilie, rida rue ọzara Zif, ya na nnù ndikom asa na ọgu iri, ndi arọputara nke Israel, ichọ Devid n'ọzara Zif.
3. Sọl we ma ulo-ikwū-ya n'ugwu ntà Hakila, nke di n'iru ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu, n'akuku uzọ. Ma Devid nānọdu n'ọzara, ọ hu na Sọl abiawo, nēso ya n'azu rue ọzara.
4. Devid we ziga ndi-nledo, mara na Sọl abiawo n'ebe o dozisiri onwe-ya.
5. Devid we bilie, biarue ebe Sọl mara ulo-ikwū-ya: Devid we hu ebe ahu, bú ebe Sọl nēdina, ya na Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya: ma Sọl nēdina n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, ndi Israel nānọ kwa n'ulo-ikwū buruburu ya.
6. Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.
7. Devid na Abishai we biakute ndi Israel n'abali: ma, le, Sọl nēdina n'ura n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, atugide-kwa-ra ube-ya n'ala n'akuku isi-ya: Abnea na ndi Israel nēdina kwa ya buruburu.
8. Abishai we si Devid, Chineke emechibidowo onye-iro-gi nye n'aka-gi ta: ma ub͕u a, biko, ka m'were ube tugide ya n'ala otù ub͕ò, m'gaghi-atu kwa ya nke ub͕ò abua.
9. Devid we si Abishai, Ebibila ya: n'ihi na ònye ka ikpe nāmaghi n'iseti aka-ya megide onye Jehova etere manu?
10. Devid we si, Jehova nādi ndu, Jehova aghaghi itib͕u ya; ma-ọbu ubọchi-ya gābiaru, o we nwua; ma-ọbu na ọ gārida n'agha, ewe kpochapu ya.
11. Ya burum ihe-árú sitere na Jehova, bú iseti akam megide onye Jehova etere manu: ma ub͕u a, biko, were ube di n'akuku isi-ya, na ite miri, ka ayi la.
12. Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.
13. Devid we gabiga n'ofè ọzọ, guzo n'elu ugwu n'ebe di anya; ebe-mbara n'etiti ha riri nne:
14. Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù?
15. Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n'Israel? n'ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n'ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi.
16. Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.