1. Samuel 26:14-25 Bible Nso (IGBOB)

14. Devid we kpọ ndi Israel òkù, kpọ kwa Abnea nwa Nea, si, Ì zaghi, Abnea? Abnea we za, si, Ònye ka i bu nke nākpọ eze òkù?

15. Devid we si Abnea, Ọ̀ bughi nwoke ka i bu? ònye di kwa ka gi n'Israel? n'ìhi gini kwa ka i nēdebeghi onye-nwe-gi, bú eze, nke-ọma? n'ihi na otù onye nime ndi Israel batara ibibi eze, bú onye-nwe-gi.

16. Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.

17. Sọl we mata olu Devid, si, Ọ̀ bu olu-gi bú nka, nwam Devid? Devid we si, Ọ bu olum, onye-nwem, eze.

18. Ọ si kwa, N'ìhi gini kwa ka onye-nwem nāchu orù-ya n'azu? n'ihi na gini ka m'mere? ìhe ọjọ gini di kwa n'akam?

19. Ma ub͕u a, biko, ka onye-nwem, bú eze, nuru okwu nile nke orù-ya. Ọ buru na Jehova arafuwo gi imegidem, Ya nu ísì utọ nke onyinye-inata-iru-ọma: ma ọ buru umu madu, ndi anābu ọnu ka ha bu n'iru Jehova; n'ihi na ha achupuwom ta n'irapara n'aru ihe-nketa Jehova, si, Je, fè chi ọzọ òfùfè.

20. Ma ub͕u a, ka ọbaram ghara ida n'ala pua n'iru Jehova: n'ihi na eze Israel aputawo ichọ otù igwu, dika mb͕e madu nāchu ntá ọkwa n'ugwu.

21. Sọl we si, Emehiewom: lata, nwam Devid: n'ihi na m'gaghi-emejọ gi ọzọ, n'ihi na ndum di oké ọnu-ahia n'anya-gi ta: le, emewom ihe-nzuzu, me kwa ihe nke-uku ri nne n'amaghi-ama.

22. Devid we za, si, Le, ube-gi, eze! ka otù onye nime umu-okorọbia feta kwa, were ya.

23. Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.

24. Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.

25. Sọl we si Devid, Onye agọziri agọzi ka i bu, nwam Devid: i gēme kwa ihe nke-uku, nwe kwa ike nke-uku. Devid we je n'uzọ-ya, ma Sọl laghachiri n'ebe-ya.

1. Samuel 26