1. Samuel 24:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.

12. Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi.

13. Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n'aru gi.

14. Ònye ka eze Israel putaworo iso n'azu? ònye ka i nāchu n'azu? ọ bu n'azu nkita nwuru anwu, n'azu otù igwu.

15. Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n'etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n'ikpe, kpeputam n'aka-gi.

16. O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.

1. Samuel 24