1. Samuel 23:20-22 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze.

21. Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.

22. Biko, lanu, dozi-kwa-nu ọzọ, mára hu kwa ọnọdu-ya ebe ukwu-ya di, na onye huworo ya n'ebe ahu: n'ihi na agwawom na ya onwe-ya nāghọ aghughọ nke-uku.

1. Samuel 23