17. Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.
18. Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya.
19. Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n'etiti ayi n'ebe ewusiri ike n'oké ọhia, n'ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu?
20. Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze.
21. Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.