8. na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.
9. Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.
10. O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.
11. Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile.