41. Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.
42. Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.