18. Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n'ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n'efu.
19. Ma mb͕e i nọdusiri ubọchi atọ i garida ọsọsọ, ba n'ebe ahu, bú ebe izoro onwe-gi n'ubọchi ihe ahu emere, i gānọdu kwa n'akuku nkume Ezel.
20. Mu onwem gāb͕a kwa àkú atọ n'akuku-ya, dika agāsi na ab͕aram ihe m'dotara.
21. Ma, le, m'gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n'akuku azu gi: chiri ha bia; n'ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu.
22. Ma ọ buru na asim nwata-okorọbia ahu otú a, Le, àkú di n'akuku iru gi: la; n'ihi na Jehova ezilagawo gi.
23. Ma okwu ahu nke mu na gi kwuworo, le, Jehova nọ n'etiti mu na gi rue mb͕e ebighi-ebi.