14. Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu:
15. kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n'ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n'elu uwa.
16. Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid.
17. Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.
18. Jonatan we si ya, Echi ka ọnwa ọhu gāpu: agēle kwa anya gi, n'ihi na agēle anya ọnọdu-gi nke tọb͕ọrọ n'efu.
19. Ma mb͕e i nọdusiri ubọchi atọ i garida ọsọsọ, ba n'ebe ahu, bú ebe izoro onwe-gi n'ubọchi ihe ahu emere, i gānọdu kwa n'akuku nkume Ezel.
20. Mu onwem gāb͕a kwa àkú atọ n'akuku-ya, dika agāsi na ab͕aram ihe m'dotara.
21. Ma, le, m'gēziga nwa-okorom, si, Je, chọta àkú nile. Ọ buru na asim nwa-okoro ahu ma-ọli, Le, àkú di n'akuku azu gi: chiri ha bia; n'ihi na udo diri gi, okwu adighi kwa, Jehova nādi ndu.
22. Ma ọ buru na asim nwata-okorọbia ahu otú a, Le, àkú di n'akuku iru gi: la; n'ihi na Jehova ezilagawo gi.
23. Ma okwu ahu nke mu na gi kwuworo, le, Jehova nọ n'etiti mu na gi rue mb͕e ebighi-ebi.
24. Devid we zo onwe-ya n'ọhia: ubọchi ọnwa ọhu we rue, eze we nọdu na nri iri ihe.
25. Eze we nọkwasi n'ọnọdu-ya, dika ọ nēme ub͕ò ub͕ò, bú n'ọnọdu di n'akuku mb͕idi; Jonatan we bilie, Abnea we nọdu n'akuku Sọl: ma elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu.
26. Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha.