17. Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.
18. Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.
19. Nne-ya we mere ya uwe-nwuda ntà, chigoro ya kwa-arọ, mb͕e o soro di-ya rigo ichu àjà arọ.
20. Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha.
21. N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova.
22. Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
23. O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile.
24. É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.
25. Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua
26. Nwa-okoro ahu, bú Samuel, we nētó nāga n'iru, o we di nma, ma n'ebe Jehova nọ, ma n'ebe madu nọ.
27. Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero?