4. Jonatan we gwa Sọl nna-ya okwu di nma bayere Devid, si ya, Ka eze ghara imehie megide orù-ya, bú Devid; n'ihi na o mehieghi megide gi, na n'ihi na omume-ya nile adiwo nma nke-uku n'ebe i nọ:
5. n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu?
6. Sọl we ge nti olu Jonatan: Sọl we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, agaghi-eme ka ọ nwua ma-ọli.
7. Jonatan we kpọ Devid, Jonatan we gosi ya ihe ndia nile. Jonatan we me ka Devid biakute Sọl, o we nọ n'iru ya, dika na mb͕e gara aga.