1. Samuel 19:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. Ewe gosi Sọl, si, Le, Devid nọ na Naiot nime Rema.

20. Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid: ha we hu nzukọ ndi-amuma ahu ka ha nēbu amuma, ha hu kwa Samuel ka ọ nēguzo, dika onye-isi-ha: Mọ nke Chineke we dikwasi ndi-ozi Sọl, ha onwe-ha we bū kwa amuma.

21. Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma.

22. Ya onwe-ya we je kwa Rema, biarue olùlù-miri uku nke di na Seku: ọ jua, si, Òle ebe Samuel na Devid nọ? Otù onye we si, Le, ha nọ na Naiot nime Rema.

23. O we je n'ebe ahu, rue Naiot nime Rema: Mọ nke Chineke we dikwasi kwa ya, o we nēje, we bue amuma, rue mb͕e ọ batara Naiot nime Rema.

24. Ya onwe-ya we yipu kwa uwe-ya nile, ya onwe-ya we bū kwa amuma n'iru Samuel, da n'ala b͕ara ọtọ ubọchi ahu nile na abali-ya nile. N'ihi ya ka ha nāsi, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

1. Samuel 19