1. Samuel 17:38-47 Bible Nso (IGBOB)

38. Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n'isi-ya, yikwasi ya uwe-agha.

39. Devid we kekwasi mma-agha-ya n'uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n'ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n'ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n'aru ya.

40. O were nkpa-n'aka-ya n'aka-ya, rọputara onwe-ya nkume ise kwọrọ murumuru na miri-iyi, tiye ha n'ihe ndi-ọzùzù-aturu nke o nwere, bú n'àkpà-ya; èbè-ya di kwa n'aka-ya: o we biarue nso onye Filistia ahu.

41. Onye Filistia ahu we bia, ọ nābia nēru kwa nso Devid; nwoke ahu nke nēbu ọta-ya nēje kwa n'iru ya.

42. Onye Filistia ahu we legide anya buruburu, hu Devid, we lelìa ya anya: n'ihi na ọ bu nwata, nācha kwa ọbara-ọbara, ma kwa nma ile anya.

43. Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid.

44. Onye Filistia ahu we si Devid, Biakutem, ka m'were kwa anu-aru-gi nye anu-ufe nke elu-igwe na anumanu nke ọhia.

45. Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta.

46. Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:

47. ya na ka nkpọkọta nka nile we mara na ọ bughi mma-agha na ube ka Jehova ji azọputa: n'ihi na Jehova nwe agha nka, Ọ gēnye kwa unu n'aka-ayi.

1. Samuel 17