20. Devid we bilie n'isi-ututu, rapu ìgwè ewu na aturu ahu n'aka onye nēdebe aturu, o we būru, je, dika Jesi nyere ya iwu: o we biarue ebe anēdebe ub͕ọ-ala, mb͕e usu-ndi-agha ndi nāpukuru usoro-agha nēti nkpu n'agha.
21. Israel na ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro-agha izute usoro-agha.
22. Devid we zitu ihe nile o bu rapu n'aka onye nēdebe ihe, o we b͕abà n'usoro-agha, bia, jua umu-nne-ya ajuju bayere udo-ha.
23. Ma mb͕e ya na ha nēkwu okwu, le, onye-nputa-ọb͕ọ-agha ahu nēsi n'usoro-agha ndi Filistia rigota, bú onye Filistia ahu, Gọlaiat bu aha-ya, sitere na Gat, ọ we kwue dika okwu ndia si di: Devid we nu ha.
24. Ndikom nile nke Israel, mb͕e ha huru nwoke ahu, ha we b͕apu n'iru ya, tua egwu nke-uku.
25. Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n'ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n'Israel.
26. Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n'aru Israel? n'ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta?
27. Ndi Israel we gwa ya okwu dika okwu a si di, si, Otú a ka agēmere nwoke nke gētib͕u ya.
28. Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo.
29. Devid we si, Gini ka m'meworo ub͕u a? ọ̀ bughi okwu efu, bu ihe a m'nēkwu?
30. O we si n'akuku ya chigharia, che onye ọzọ iru, kwue dika okwu a si di: ndi Israel we zaghachi ya okwu dika okwu mbu si di.
31. Ewe nu okwu nke Devid kwuru, ha we gosi ha n'iru Sọl, o we nara ya.
32. Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n'ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù.
33. Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n'ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata.
34. Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu,
35. m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua.