29. Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire.
30. Ànya ndi Israel gēsi aṅa ghara inwukari enwu nke-uku, ma ọ buru na ha rijuru afọ ta site n'ihe-nkwata ndi-iro-ha nke ha hutara? n'ihi na ub͕u a ntib͕u n'etiti ndi Filistia abaghi uba.
31. Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku.
32. Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n'agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n'ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara.
33. Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n'iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta.
34. Sọl we si, B͕asanu onwe-unu n'etiti ndi Israel, si ha, Wetaranum nso, nwoke ọ bula ehi-ya, na nwoke ọ bula aturu-ya, b͕u-kwa-nu ha n'ebe a, rie; unu emehie-kwa-la megide Jehova n'iri anu. ya na ọbara. Ndi Israel nile we weta nso, nwoke ọ bula ehi-ya n'aka-ya n'abali ahu, ha we b͕ue ha n'ebe ahu.
35. Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova.
36. Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a.